☼☼☼☼☼☼☼☼☼☼☼☼ P. O. Box 18858, Philadelphia, Pennsylvania 19119 U.S.A. ☼☼☼☼☼☼☼☼☼☼

Home
Up
Omenala-Igbo Customs
Oha Ndom
Igbo Childhood
Music
I Saw the Sky Catch Fire
Reviews & Bibliography
Excerpts
Reader Reviews
Ask the Author
Ordering Copies

 

 

 

Onye Isi na Onye Ngwörö

 

Igbo Language Compositions by Dede Obinkaram Echewa

(Unfinished early draft -- Copyright © 2004 -- text)

 

_______________

 

 

      Odukwara ngbe oduru,  oke unwu ada-a na otu obodo an’akpö Amaegbu.  Unwu-a jörö njö gafee oke.  Ebe n’ile kpörö nku, ma ala, ma elu, ma n’öhia, ma n’ulö.  Anwu na okpom-öku ekwegh ndi madu zuo ike na ikete owu, möbu hia ura na anyasi.  Ikuku adighi, yila-yila adighi.  Ihe nile akuru n’ubi nwukpörö anwukpö.  Nwoke na nwanyi ahugh ihe n’eri-eri.  Eghu erigh, ökukö atugh!*

            Abia na ndi n’ile bi na ala Amaegbu, ödi madu n’abu furu iche.  Otu bu onye isi, ji nkpara achö uzö; nke ödö aburu onye ngwörö, na egbe-egbe, na echi-echi n’ala.  Ha abuö ji otu ntu nö na isi ahia were mere ulö. 

     Mgbe ala di nma, onye isi na onye ngwörö abugh ndi oke nri, ma ha na eriju afö sita ihe ufödi umu nwanyi reförön’ahia.  Mgbe unwu dara, ahia anakwagh azu.  ötutu umu nwanyi enwekwagh ihe ha onwe ha, m’öbu di ha, m’öbu umu ha n’eri, ka öfö  nke eji emere onye isi na onye ngwörö odo. 

            Ya mere ka agu-u ji guo onye isi n’onye ngwörö  gusia ha ike.  Chi ejia, agu-u.  Chi avö-ö, aguu.  Onye isi na onye ngwörö gana anwu anwu  na ihi aguu.  Chi ejia vö-ö, jighariakwa, vöghariakwa, ma na ödigh ihe ndi iche.  Onye isi na onye ngwörö akara öma, n’akasi onwe ha obi.

            Na otu anyasi, onye isi akpö-ö onye ngwörö, si ya, “Nna-a, ödi nma ka anyi nwuö n’efu, na adigh uzö anyi si megharighia  ahu, mara ma odi ihe anyi nwere ike ime  iji chota ri.  Onwegh ihe anyi nwere ike ime?”

Ha abuo kpönö ebe ha na ehi ura na nkpum-kpu no na isi ahia.

            “Di ka gini ka anyi nwere ike ime?” bu ihe onye ngwörözara onye isi.

            “Dika ileghari anya, megharia ahu, mara ma ödi ebe anyi nwere ike ichöta ihe ana eri-eri.”

     “Ebe ole?”

      Onye isi elo-o asu, kwa-a ikiri, “Ahem!” legide onye ngwörö anya shee-ee.  Ha abuö ebido tughariwa ntughari. 

      Ihe ha tugharitara bu iga na oba Eze Afö Ejugh-Eju, mara ma onwere ihe ana eri-eri ha ga ahu.  Ha echewa ngbe onwa futara, gbasiwa ike.  Onye isi aburu ukwu n’aga ije, vuru onye ngwöro na ngu gawa n’öba Eze.  Onye ngwörö aburu anya n’ahu uzö, na atuziri onye isi aka uzö.  Ihe ana eri eri juru eju n’öba Eze.  Ma ji.  Ma ede. Ma öka oru ma jiakpu, ha nile mere bökwu.  Onye isi na onye ngwörö ewere oke ha nwere ike ivu, laghachi na ntu ebe ha bi na isi ahia.  Fe-e öku.  Huöji.  Ruö öka oru.  Rijuo afö.  Nnuo miri.  Husia önu.  Gbö-ö ubiri ndi afö juru.  Ghe-e ughere.  Da-a mba.  Hiri ura, otu ha na ehibegh oke ngbe önwa ise m’öbu isii. 

        Chi avöla, ala eze-e kuku-ruru, turu etere!**   Ndi nrasi-aka Eze na ndi na agbara ya böyi-böyi etia nkpu, kuo ekwe.  Kpoyi!  Kpoyi! Kpoyi! 

“Ala efuola!”

      “Ala efuola!”

      Nwoke na nwanyi ajuö si, “Gini mere?”

“Ohi ezuola.  Madu gara n’öba Eze zuo ohi!”

Eze na onwe ya we-e oke iwe, gba-a isi n’ala.  ödika anwuru öku si ya n’imi  na efepu!  öbugh sö-sö na ezuru ya, ihe kacha njö bu alili elere ya.  Na madu agalaba ukwu na abu, madu chi kere, nne muru, nwere obisike zörö ukwu zöba na öba ya, zuo ya ohi.  Onye zuru ohia, öka nma ma onye ahu ji shi anyuru anyu tee eze n’ihu!

      Madu n’ile nö na Amaegbu amara jijiji futa na ökasaa Ahia Egbu.  Eze eziga ndi ozi ya Igwe Nkala, ivuta oke agbara ana akpö Ezi Okwu Bu Ndu.  Onye öbula bi na Amaegbu ga adu isi gbasara ohi-a  ezuru Eze.  Ma nwoke, ma nwanyi.  Ma okobiri, ma eku-n’aka.  Ma agböghö, ma okoröbia.  Ezi Okwu Bu Ndu bu agbara öjö-ö  Ejigh ya egwu egwuru-egwu.  önagh anu ntughari okwu.  Onye zöjörö ukwu n’ihu ya, uka ya agwula!  Onye zuru ohi, onye ghara ugha, onye kwuhiere önu, uka ya agwula!  Muö egbuola ya!

            Idu isi ebido.  N’otu, na  otu, ndi Amaegbu nile aduö isi.   ödigh onye muö gburu!

            Madu n’ile anuö peeeh, n’achö ighöta  ihe n’emenu. 

            Na ntumade, Eze echeta onye isi na onye ngwörö, si kpö-ö ha, ka ha soro ndi amala ndi özö duö isi. 

            Madu nile nö na ökasaa efufe-e isi, na enwegh nghöta ihe gbasara echiche Eze.  Onye isi anagh ahu uzo.  Onye ngwörö anagh aga ije.  Ndighikwanu otu ha ji nwere ike iba na öba Eze, ka öfö izu ohi?

            Ihe ndi Amaegbu vu n’uche, ma öbu ke ha kwufutura ekwufuta, emetutugh Eze ria-ria.  Eze ekwuola, okwu ya enwegh ikpöghachi azu.  Onye isi na onye ngwörö ga aduriri isi!

            Otu onye nrasiaka eze atukwuru onye isi n’aka, guzowa ya na ihu Muö.  Onye isi aduö isi, si, “Agbara n’ahu uzö, lezia’m anya.  Dika otu isi mara, isi kpurum oke ngbe nji futa uwa.  Imarala si, na oke ngbe nnem ji muö-m, anyam emetubegh öba Eze!. . .”

            Ndi Amaegbu ekwe zem, si, “öduola!  Oduöla!” 

            ödigh ihe Agbara mere onye isi. 

            Onye ngworo egere futa n’ihu muo, si, “Agbara Ezi Okwu, lezia’m anya.  Dika otu isi mara, abum onye ngwörö.  Anam egbere egbere, na apu apu dika aju ala.  Oke mgbe nji futa uwa, ukwu’m emetubegh n’öba Eze!”

Ndi Amaegbu ekwe zem, si, “öduola!  öduöla!” 

Odigh ihe Agbara mere onye ngworo. 

Madu n’ile anö-ö bayi-i.  Ufö ndi ata-a aka na önu.  Ebe öbula elere anya, ngbagwuju anya eju.  Madu nile aduöla isi, ma na ödigh onye Agbara gburu. 

“Ahem!”  Eze AföEjugh-Eju akwa-a ikiri.  Madu nile elekwasi ya anya.  Na otu ntabi anya, Eze etia nkpu, dika onye anwira aka na nkölö.  Anya ebido imiya n’isi.  Fee-eeh!  Kpom!  Eze adaa n’ala, gbawa oligh-li dika eghu egbubere isi.  Mgbe ana agula “nna-a, buö, atö,” Eze anwuöla. 

Ebube! Akpukpa! Ujö!  Ujo ejide nwoke na nwanyi nö na ökasaa.  Mee akah, mee ihie, tee nzu tee odo, ma achuru aja, ma ajuru ogu, ma afuru onunu, ma agworo ogwu, ihe mere Eze enwegh nghöta.  Nwegh nmeta!  Nwegh ngwöta!

“Gini mere?  Gini mere?” bu ajuju madu nile juru. 

Ndi dibia vutura Agbara maa aka n’akpa ha weputa ngwa ögwu eji eku Muö, weputa ebe*** huö ya yoko-yoko, weputa otu-anya, tuo   onwe ha ögwu n’anya.  Ngbe ha mechara ihe kwesiri ekwesi, ha ajuö Agbara ajuju: “Ndagha?”

Agbara Ezi Okwu Bu Ndu azaa, si: “Onye öbula gee nti.  Ezi okwu dika nkpisi uvuru, anghi arö ya arö.   Ezi okwu di na-mpa, na-mpa.  Ufödi ka ibe ya.  Abia na izu ohi, onye kikeghi-dere ri aka, kpaghide ya ogba mgbe unwu dara, ngbe  ndi özö n’anwu n’aguu, onye di otua zukachara onye öbula na ohi!” 

Ndi Amaegbu efufee isi, gbaa ulu-aka piörökötöm piöm!

Ndi aguu ji echetakwagh na ozu Eze ga gbötökwara na ökasaa.  Ha ekworo ri-ri-ri gawa na öba Eze, ichö ihe ana eri eri.  Ufödu ha asi: “Eze ukwu na nwa öha!  Eze Afö Ejugh-Eju.  Eze ome nta eme imo!  Onye ma ma onwere ike igwu ala lia onwe ya!”

 

__________________________________________

Notes: *Eghu erigh, ökukö atugh -- an expression usually applied to prolonged downpour, which makes it impossible for animals like goats and chickens to forage for food. .

            **

            *** 

______________________________________________

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

   

Up