Igbo
Language Compositions by Dede Obinkaram Echewa
(Unfinished early draft -- Copyright
© 2004 --
text)
_______________
Odukwara ngbe oduru, oke unwu ada-a na otu
obodo an’akpö
Amaegbu. Unwu-a jörö
njö
gafee oke. Ebe n’ile kpörö
nku, ma ala, ma elu, ma n’öhia,
ma n’ulö.
Anwu na okpom-öku
ekwegh ndi madu zuo ike na ikete owu, möbu
hia ura na anyasi. Ikuku adighi, yila-yila adighi. Ihe nile akuru
n’ubi nwukpörö
anwukpö.
Nwoke na nwanyi ahugh ihe n’eri-eri. Eghu erigh,
ökukö
atugh!*
Abia na ndi n’ile bi na ala Amaegbu, ödi madu n’abu furu iche. Otu bu
onye isi, ji nkpara achö uzö; nke ödö aburu onye ngwörö, na egbe-egbe,
na echi-echi n’ala. Ha abuö ji otu ntu nö na isi ahia were mere ulö.
Mgbe ala di
nma, onye isi na onye ngwörö abugh ndi oke nri, ma ha na eriju afö sita
ihe ufödi umu nwanyi reförön’ahia. Mgbe unwu dara, ahia anakwagh azu.
ötutu umu nwanyi
enwekwagh ihe ha onwe ha, m’öbu di ha, m’öbu umu ha n’eri, ka öfö nke
eji emere onye isi na onye ngwörö odo.
Ya
mere ka agu-u ji guo onye isi n’onye ngwörö gusia ha ike. Chi ejia,
agu-u. Chi avö-ö, aguu. Onye isi na onye ngwörö gana anwu anwu na ihi
aguu. Chi ejia vö-ö, jighariakwa, vöghariakwa, ma na ödigh ihe ndi
iche. Onye isi na onye ngwörö akara öma, n’akasi onwe ha obi.
Na
otu anyasi, onye isi akpö-ö onye ngwörö, si ya, “Nna-a, ödi nma ka anyi
nwuö n’efu, na adigh uzö anyi si megharighia ahu, mara ma odi ihe anyi
nwere ike ime iji chota ri. Onwegh ihe anyi nwere ike ime?”
Ha abuo kpönö
ebe ha na ehi ura na nkpum-kpu no na isi ahia.
“Di ka gini ka anyi nwere ike ime?” bu ihe onye ngwörözara onye isi.
“Dika ileghari anya, megharia ahu, mara ma ödi ebe anyi nwere ike ichöta
ihe ana eri-eri.”
“Ebe
ole?”
Onye isi
elo-o asu, kwa-a ikiri, “Ahem!” legide onye ngwörö anya shee-ee. Ha
abuö ebido tughariwa ntughari.
Ihe ha
tugharitara bu iga na oba Eze Afö Ejugh-Eju, mara ma onwere ihe ana
eri-eri ha ga ahu. Ha echewa ngbe onwa futara, gbasiwa ike. Onye isi
aburu ukwu n’aga ije, vuru onye ngwöro na ngu gawa n’öba Eze. Onye
ngwörö aburu anya n’ahu uzö, na atuziri onye isi aka uzö. Ihe ana eri
eri juru eju n’öba Eze. Ma ji. Ma ede. Ma öka oru ma jiakpu, ha nile
mere bökwu. Onye isi na onye ngwörö ewere oke ha nwere ike ivu,
laghachi na ntu ebe ha bi na isi ahia. Fe-e öku. Huöji. Ruö öka oru.
Rijuo afö. Nnuo miri. Husia önu. Gbö-ö ubiri ndi afö juru. Ghe-e
ughere. Da-a mba. Hiri ura, otu ha na ehibegh oke ngbe önwa ise m’öbu
isii.
Chi
avöla, ala eze-e kuku-ruru, turu etere!** Ndi nrasi-aka Eze na ndi na
agbara ya böyi-böyi etia nkpu, kuo ekwe. Kpoyi! Kpoyi! Kpoyi!
“Ala efuola!”
“Ala
efuola!”
Nwoke na
nwanyi ajuö si, “Gini mere?”
“Ohi ezuola.
Madu gara n’öba Eze zuo ohi!”
Eze na onwe ya
we-e oke iwe, gba-a isi n’ala.
ödika anwuru öku si ya n’imi na efepu! öbugh sö-sö na ezuru ya,
ihe kacha njö bu alili elere ya. Na madu agalaba ukwu na abu, madu chi
kere, nne muru, nwere obisike zörö ukwu zöba na öba ya, zuo ya ohi.
Onye zuru ohia, öka nma ma onye ahu ji shi anyuru anyu tee eze n’ihu!
Madu
n’ile nö na Amaegbu amara jijiji futa na ökasaa Ahia Egbu. Eze eziga
ndi ozi ya Igwe Nkala, ivuta oke agbara ana akpö Ezi Okwu Bu Ndu. Onye
öbula bi na Amaegbu ga adu isi gbasara ohi-a ezuru Eze. Ma nwoke, ma
nwanyi. Ma okobiri, ma eku-n’aka. Ma agböghö, ma okoröbia. Ezi Okwu
Bu Ndu bu agbara öjö-ö Ejigh ya egwu egwuru-egwu.
önagh anu ntughari
okwu. Onye zöjörö ukwu n’ihu ya, uka ya agwula! Onye zuru ohi, onye
ghara ugha, onye kwuhiere önu, uka ya agwula! Muö egbuola ya!
Idu isi ebido. N’otu, na otu, ndi Amaegbu nile aduö
isi.
ödigh
onye muö
gburu!
Madu n’ile anuö peeeh, n’achö ighöta ihe n’emenu.
Na
ntumade, Eze echeta onye isi na onye ngwörö, si kpö-ö ha, ka ha soro ndi
amala ndi özö duö isi.
Madu nile nö na ökasaa efufe-e isi, na enwegh nghöta ihe gbasara echiche
Eze. Onye isi anagh ahu uzo. Onye ngwörö anagh aga ije. Ndighikwanu
otu ha ji nwere ike iba na öba Eze, ka öfö izu ohi?
Ihe ndi Amaegbu vu n’uche, ma öbu ke ha kwufutura ekwufuta, emetutugh
Eze ria-ria. Eze ekwuola, okwu ya enwegh ikpöghachi azu. Onye isi na
onye ngwörö ga aduriri isi!
Otu onye nrasiaka eze atukwuru onye isi n’aka, guzowa ya na ihu Muö.
Onye isi aduö isi, si, “Agbara n’ahu uzö, lezia’m anya. Dika otu isi
mara, isi kpurum oke ngbe nji futa uwa. Imarala si, na oke ngbe nnem ji
muö-m, anyam emetubegh öba Eze!. . .”
Ndi Amaegbu ekwe zem, si, “öduola! Oduöla!”
ödigh ihe Agbara mere
onye isi.
Onye ngworo egere futa n’ihu muo, si, “Agbara Ezi Okwu, lezia’m anya.
Dika otu isi mara, abum onye ngwörö. Anam egbere egbere, na apu apu
dika aju ala. Oke mgbe nji futa uwa, ukwu’m emetubegh n’öba Eze!”
Ndi Amaegbu
ekwe zem, si, “öduola! öduöla!”
Odigh ihe
Agbara mere onye ngworo.
Madu n’ile
anö-ö bayi-i. Ufö ndi ata-a aka na önu. Ebe öbula elere anya,
ngbagwuju anya eju. Madu nile aduöla isi, ma na ödigh onye Agbara
gburu.
“Ahem!” Eze
AföEjugh-Eju akwa-a ikiri. Madu nile elekwasi ya anya. Na otu ntabi
anya, Eze etia nkpu, dika onye anwira aka na nkölö. Anya ebido imiya
n’isi. Fee-eeh! Kpom! Eze adaa n’ala, gbawa oligh-li dika eghu
egbubere isi. Mgbe ana agula “nna-a, buö, atö,” Eze anwuöla.
Ebube!
Akpukpa! Ujö! Ujo ejide nwoke na nwanyi nö na ökasaa. Mee akah, mee
ihie, tee nzu tee odo, ma achuru aja, ma ajuru ogu, ma afuru onunu, ma
agworo ogwu, ihe mere Eze enwegh nghöta. Nwegh nmeta! Nwegh ngwöta!
“Gini mere?
Gini mere?” bu ajuju madu nile juru.
Ndi dibia
vutura Agbara maa aka n’akpa ha weputa ngwa ögwu eji eku Muö, weputa
ebe*** huö ya yoko-yoko, weputa otu-anya, tuo onwe ha ögwu n’anya.
Ngbe ha mechara ihe kwesiri ekwesi, ha ajuö Agbara ajuju: “Ndagha?”
Agbara Ezi
Okwu Bu Ndu azaa, si: “Onye öbula gee nti. Ezi okwu dika nkpisi uvuru,
anghi arö ya arö. Ezi okwu di na-mpa, na-mpa. Ufödi ka ibe ya. Abia
na izu ohi, onye kikeghi-dere ri aka, kpaghide ya ogba mgbe unwu dara,
ngbe ndi özö n’anwu n’aguu, onye di otua zukachara onye öbula na ohi!”
Ndi Amaegbu
efufee isi, gbaa ulu-aka piörökötöm piöm!
Ndi aguu ji
echetakwagh na ozu Eze ga gbötökwara na ökasaa. Ha ekworo ri-ri-ri gawa
na öba Eze, ichö ihe ana eri eri. Ufödu ha asi: “Eze ukwu na nwa öha!
Eze Afö Ejugh-Eju. Eze ome nta eme imo! Onye ma ma onwere ike igwu ala
lia onwe ya!”
__________________________________________
Notes:
*Eghu erigh, ökukö atugh -- an expression
usually applied to prolonged downpour, which makes it impossible for
animals like goats and chickens to forage for food. .
**
***
______________________________________________